Ọnọdụ ihu igwe na-ezo aka n'oge ga-abịa n'ọdịnihu mgbè ọkwa nke gas na-ekpo ọkụ na ikuku kwụsịrị ịrịgo ma bídó ịda.[1] Drawdown bụ ihe dị ịrịba ama n'ịtụgharị mgbanwe ihu igwe ma mechaa belata okpomọkụ ụwa.[2] Project Drawdown na-ezo aka n'òtù na-enweghị uru nke nwéré ebumnuche inyere ụwa aka iru ala ma kwụsị mgbanwe ihu igwe na-emebi ngwa ngwa, n'enweghị nsogbụ, na n'ụzọ ziri ezi. N'afọ 2017, akwụkwọ akpọrọ "Drawdown" ghọrọ akwụkwọ kacha ere ahịa na New York Times, ebe ọ gosipụtara ma kọwaa ihe ngwọta dị íchè íchè na mbọ dịnụ iji nyéré aka iru ihe mgbaru ọsọ a.