ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | South Africa |
aha enyere | Susan |
ụbọchị ọmụmụ ya | 28 Febụwarị 1956 |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, minister |
Ọkwá o ji | member of the National Assembly of South Africa, member of the National Assembly of South Africa, Minister of Social Development, Minister of Women in the Presidency, Minister of Mineral Resources |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | African National Congress |
so na | World Economic Forum Annual Meeting 2013 |
kọwara na URL | https://www.parliament.gov.za/person-details/4195, https://www.pa.org.za/person/susan-shabangu/ |
Susan Shabangu (28 Febụwarị 1956) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa bụ onye otu ndị omeiwu na-anọchite anya African National Congress kemgbe ọnwa Mee 1994.[1] Ọ nọbu n'ọkwa Minista nke Mmepe Ọha.[2] Tupu nke ahụ, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista nke Ụmụ nwanyị na Presidency, nke Onye isi ala Jacob Zuma guzobere n'ọnwa Mee 2014.[3][4] Ọ bụ Minista nke Mineral Resources site n'afọ 2009 ruo afọ 2014.[5]
Susan Shabangu gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya na Madibane High School na Soweto n'afọ 1977.[6]
Tupu a họpụta ya na gọọmentị, Shabangu na-arụsi ọrụ ike n'òtù ndị ọrụ.[3] Site n'afọ 1980 ruo afọ 1985, ọ bụ osote odeakwụkwọ maka Federation of South African Women (FEDSAW).[6] Ọ bụkwa onye otu Federation of Transvaal Women (FEDTRAW). N'afọ 1981, ọ bụ otu n'ime ndị otu Anti-Republic Campaign Committee. N'afọ 1982, ọ rụrụ ọrụ na Kọmitii Mgbasa Ozi Mandela. N'afọ 1984-85 ọ haziri Amalgamated Black Workers Project. Ọ rụrụ ọrụ na Kansụl Ụlọ Ọrụ ma bụrụ onye nhazi ụmụ nwanyị nke Transport and General Workers Union (T&GWU). Ọ rụrụ ọrụ na National Women's Sub-committee nke Congress of South African Trade Unions (COSATU).[7]